Exodus 20

Iwu Iri

1Chineke kwuru okwu ndị a niile sị:

2“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ibu ohu.

3“Ị gaghị enwe chi ọzọ tinyere m.
4Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, nʼoyiyi nke ụdị ọbụla nke yiri ihe dị nʼeluigwe maọbụ nke yiri ihe dị nʼụwa, nʼokpuru ya maọbụ nʼime mmiri, nʼokpuru ụwa. 5Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe, nʼihi na Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, abụ m Chineke ekworo. Onye na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ahụhụ, nʼihi ajọ omume nke ndị mụrụ ha, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ, nke ndị ahụ kpọrọ m asị. 6Ma na egosi ịhụnanya nye puku ọgbọ niile nke ndị hụrụ m nʼanya, bụ ndị na-edebe ihe niile m nyere nʼiwu.
7Gị ejikwala aha Onyenwe anyị bụ Chineke gị eme ihe efu, nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agụ onye ji aha ya eme ihe efu dịka onye ikpe na-amaghị.
8Cheta ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ. 9Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile. 10Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọbụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị. 11Nʼihi na ọ bụ nʼime ụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha. O zuru ike nʼụbọchị nke asaa. Nʼihi nke a Onyenwe anyị gọziri ụbọchị nke asaa doo ya nsọ, ka ọ bụrụ ụbọchị izuike.
12Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
13Gị egbula mmadụ.
14Gị akwala iko.
15Gị ezula ohi.
16Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị.
17Gị enwela anya ukwu nʼebe ụlọ onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị, maọbụ ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi gị nwere dị.”

18Mgbe ndị Izrel hụrụ egbe eluigwe, na amụma ọkụ, na opi ike, hụkwa ugwu ahụ ka o jupụtakwara nʼanwụrụ ọkụ, ha mara jijiji nʼihi egwu. Ha guzoro nʼebe dị anya, 19sị Mosis, “Biko ka gị onwe gị gwa anyị okwu, anyị ga-anụ ma ka Chineke gharakwa ịgwa anyị okwu, ma ọ bụghị ya, anyị ga-anwụ.”

20Mosis sịrị ndị Izrel, “Unu atụkwala ụjọ, nʼihi na Chineke bịara ịnwale unu ime ka unu na-atụ ya egwu mgbe ọbụla ka unu ghara imehie megide ya.”

21Nʼihi nke a, mmadụ niile guzoro nʼebe dị anya site nʼugwu ahụ. Ma Mosis bara nʼime igwe ojii ahụ, ebe Chineke nʼonwe ya nọ.

Iwu megidere ikpere arụsị

22 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị, ‘Unu onwe unu ahụla na m si nʼeluigwe gwa unu okwu. 23Unu emerela onwe unu chi ọzọ tinyere m, chi ọlaọcha maọbụ chi ọlaedo. Unu emerela onwe unu ha.

24“ ‘Ebe ịchụ aja unu ga-ewuru m ga-abụ nke unu ji naanị aja wuo. Nʼebe ahụ ka unu ga-achụrụ m aja nsure ọkụ na aja udo. Unu ga-ejikwa igwe ewu na atụrụ, na ehi chụọrọ m aja. Unu ga-ewuru m ebe ịchụ aja naanị ebe ọbụla m mere ka aha m bụrụ ihe a na-asọpụrụ, nʼebe ahụ ka m ga-abịa gọzie unu. 25Ọ bụrụ na unu ewuo ebe ịchụ aja nkume, unu ejikwala nkume a wara awa, nʼihi na unu ga-eme ka ọ ghara ịdị nsọ ma ọ bụrụ na unu ejiri ngwa ọrụ wagharịa nkume ya. 26Unu ejila ihe nrigo gbagoro nʼebe ịchụ aja m, ka a ghara ikpughe ọtọ unu nʼelu ya.’

Copyright information for IboBIU